You can listen to Igbo conversations by clicking the icon above each conversation. You can also download the conversations by clicking here.
| - Olee maka üböchï taa? | How is the weather today? |
| - Üböchï taa dï mma. | Today’s weather is fine. |
| Ugbua bü oge ügürü. | Now it is harmattan period. |
| Mmiri anaghï ezo. | Rain is not falling. |
| Ö na-adï ökü na oge ehihie, | It is hot in the day, |
| ma na-adï oyi na abalï. | and is cold in the night. |
| Ana-ewe nnuku ikuke. | There is a lot of wind. |
| - Oge özö, ga-bü udu mmiri. | Next period, it is rainy season. |
| Nnuku mmiri ga-ezo. | A lot of rain will fall. |
| Ana-ewe nnuku urukpu. | There will be many clouds. |
| I kwesiri iweta nche anwü. | You need to bring an umbrella. |
| - E mesïa, aga-ewe ököchï. | Then, it will be the dry season. |
| Anwü ga-dï, ma ö ga-dï ökü. | There will be sun and it will be hot. |
| - Olee maka üböchï echi? | What about tomorrow’s weather? |
| - Echi, ö ga-dï anwü ma bürükwa nnukwu üböchï. | Tomorrow, there will be sun and it will be a great day. |
| - Bata n’ime onye ahïa. | Come inside customer. |
| - Olee üdï nrï unu were? | What kind of food do you have? |
| - Anyï were ji, osikapa na garri. | We have yam, rice and garri. |
| - I were agwa? | Do you have beans? |
| - Mba. | No. |
| - Esogbuna, weta garri. | Don’t worry, bring the garri. |
| - Ego ole? | How much? |
| - Weta garri naira asaa. | Bring garri worth of seven naira. |
| - Ï chörö anü? | Do you want meat? |
| - Olee etu i si ere anü? | How do you sell meat? |
| - Anyï na-ere otu naira mobu naira atö. | We sell for one naira and for three. |
| - Tinye otu anü naira atö. | Put one meat worth of three naira. |
| - Were ya. | Take it. |
| - Nye m mmiri. | Give me water. |
| - Were ya. | Have it. |
| - Tinyekue ofe. | Bring more soup |
| - Weta afere. | Bring your plate. |
| - Ofea törö ütö. | The soup is tasty. |
| - Ego ole ka m ji gï? | How much do I owe you? |
| - Ha ncha bü naira iri na abüö. | That is 12 naira. |
| - Were ego. | Take the money. |
| - Da alü. | Well done. |
| - Ka e mesïa, ka odi oge özö. | Good-bye, till next time. |
| - Anyï na-eje na ahïa ka anyï golu ngwa ahia. | We are going to the market to buy some articles. |
| - Olee ebe m ga-egota ji? | Where can I buy yam? |
| Jee na ahïa Ogbete. | Go to the Ogbete Market. |
| - Olee ebe ö dï? | Where is it? |
| - Ö dï na etiti Enugu. | It is in the center of Enugu. |
| Na ahïa: | At the market: |
| - Bïa ebea onye ahïa. | Come here customer. |
| - Nne, olee maka ahïa tata? | Madam, how is today’s market? |
| - Ahïa tata dï mma/ Ahïa tata adïghï mma. | Today’s market is fine/Today’s business is not fine. |
| - Olee ihe ï chörö biko? | What do you want please? |
| - Achörö m ji. | I want yam. |
| - Ö dï ebea? | Is it here? |
| - E-e. | Yes. |
| - Ego ole ka i na-ele otu? | How much do you sell one? |
| - Weta naira ato. | Bring three naira. |
| - Ka m kwüa otu naira. | Let me pay one naira. |
| - Mba, kwüa naira abüö. | No, bring two naira. |
| - Ö dïghï mma. | It is not good. |
| - Aga m enweta ya önüa ebe özö. | I will get it at this price elsewhere. |
| - Weta ego. | Bring the money. |
| - Weta ha ise. | Give me five. |
| - Ö dï mma jide | That is good to hold on to. |
| - Ego ole ka ha ise bü? | What is the total cost for the five? |
| - Ö bü naira iri. | It is ten naira. |
| - Welü ego | Take the money |
| - Olee ihe özö ï chörö biko, lee anya öfüma. | What more do you want to buy, please, look well. |
| - Onwerozi, ka e mesïa. | Nothing more, good-bye. |
| - Chukwu gözie gï. | God bless you. |
| - Aga m ama üzö gaa n’ülö m echi. | I am going early to my house tomorrow. |
| - Echiche gï amaka. | That is a good idea (Your idea is good). |
- Biko, gwa m ebe m ga ahü ödü ndï ügbö ala na-ga Obiöma Street?
Ö dï nso na ebea? |
Please tell me where I can find the motorpark going to Obioma Street?
Is it close from here? |
| - E-e, ö dï ezigbo nso. | Yes, it is very near. |
| - Chelu, olee ebe ï na-aga? | Wait, where are you going? |
| - Ana m aga Obiöma Street? | I am going to Obioma Street. |
| Nkea ö na-aga Obiöma Street? | Is this going to Obioma Street? |
| - E-e. | Yes. |
| - Biko, buga m Obiöma street. | Please, take me to Obioma Street |
| - Olee ebe i bi na Obiöma Street? | Where do you live in Obioma Street? |
| - Ebi m na 6, Obiöma Lane. | I live in 6, Obioma Lane. |
| - Ego ole ka ïga ana m maka ïga obioma? | How much is it to go to Obioma? |
| - Ego ole ka i ji? | How much do you have? |
| - Eji m Naira iri anö. | I have forty Naira. |
- Mba, kwüö m Naira iri ise.
- Ö dï mma. |
No, pay me fifty Naira.
Ok. |
| - Daalü enyi m, anyï ga-ahü özö. | Well done my friend, we shall see again. |
| - Deeme enyi m, jee nke öma. | Well done my friend, I wish you a good journey. |
| Ümü aka na-aga n’ülö akwükwö. | The children are going to school. |
| Aha ülö akwükwö ha bü St. Patrick. | The name of their school is St. Patrick. |
| - Nwata kïrï nwanyïa bü nwata akwükwö. | This girl is a pupil. |
| - Arö ole ka ö dï? | How old is she? |
| - Ö dï arö asatö. | She is eight years old. |
| - Olee clasï nke ö nö? | Which grade is she in? |
| - Ö nö na clasï nke atö n’ülö akwükwö prïmarï. | She is in the third grade in primary school. |
| - Olee ihe ï na-amü? | What are you studying? |
| - Ana m amü maka Bayïlöjï. | I am studying Biology. |
| - Ï ma maka Bïölögï öfüma? | Are you good at Biology? |
| - E-e, ama m öfüma. | Yes, I am good. |
| - Na oge ehihie, ana m amü ka esi eme mgbakö na nwepu. | In the afternoon, I study calculations. |
| - Olee ihe ï chörö ïbü? | What do you want to become? |
| - Achörö m ïbü njïnïa. | I want to become an engineer. |
| Achörö m ïga ülö mahadüm nke kasi mma. | I want to go to the best university. |
| - Nwanyia ö bü onye nkuzi gï? | Is she your teacher? |
| - Mba, ö na akuzi na ülö akwükwö seköndïrï. | No, she teaches in the secondary school. |
| - Ahü esighi m ike. | I do not feel well (my body does not feel well). |
| - Achörö m ïga hü dibïa oyibo. | I want to go and see a doctor. |
| - Ka anyï gaa ebe ahü. | Let us go there. |
| Na dibïa: | At the doctor: |
| - I bü dibïa? | Are you a doctor? |
| - E-e. Biko, nödü anï ebea | Yes. Please, sit down here. |
| - Kunie oto, ka m lele gï. | Stand up, let me examine you. |
| Echere m na ï na-arïa örïa oyi. | I think you have a cold. |
| Abükwazi m onye na ere ögwü. | I am also a medicine dealer. |
| Lee mgbörögwü osisi na akwükwö ögwü. | Here are some roots and herbs. |
| - Imela. | Thank you. |
| - Ndïa bü maka ogologo ndü. | These are for long life. |
| - Nwa m nwoke na-ebe akwa. | My son is crying. |
| Ö na-ewe isi mgbu. | He has a head-ache. |
| Achörö m ïkpörö ya gaa n’ülö ögwü. | I want to bring him to the hospital. |
| Achörö m igota ögwü ebe ahü. | I want to buy medicines there. |
| Ha gawara ülö ögwü. | They went to the hospital. |
| - Abalï öma. | Good-evening. |
| - Enyi m, olee ka i mere? | How do you do, my friend? |
| - Anyï na-aga n’ime obodo. | We are going to the village. |
| I ga-ahü ndï be m. | You will meet my family. |
| - Olee maka ndï be gï? | How is your family? |
| - Ha dï mma. | They are fine. |
| - I were nnukwu ezi n’ülö? | Do you have a large family? |
| - E-e, ewere m nna, nne, nwa nne nwoke abüö, na nwa nne nwanyï atö. | Yes, I have a father, mother, two brothers and three sisters. |
| - Aga m akpö gï aga n’ime obodo echi. | I will bring you tomorrow to the village. |
| - Ka chi foo. | Goodnight. |
| N’ime obodo: | In the village: |
| - Nnöö n’ime obodo anyï. | Welcome to our village. |
| - Nwere öjï igboa. | Take this kolanut. |
| - Imela. | Thank you. |
| - Ana m aga ikuta mmiri n’ikpere mmiri. | I am going to fetch water at the riverbank. |
| - Eji m nnukwu ite. | I have a big pot. |
| - Unu enwere mmiri, na ökülatrïk na ülö ögwü ebea? | Do you have water, electricity and a hospital here? |
| - E-e, anyï nwere ülö ögwü na ökülatrïk. Anyi enweghi mmiri. | Yes, we have a hospital and electricity. We do not have water. |
| - Anyï chörö enyem aka ndï mmepe obodo. | We want help from a development agency. |
| - Ike kwe, anyï nwere ike inye aka. | Maybe, we can help. |
| - Gïnï dï ebe ahü?! | What is there?! |
| - Echere m na ahürum agwö. | I think I saw a snake. |
| - Mba, ö bü enwe. | No, it is a monkey. |
| Ka anyï rie nrï. | Let us eat. |
| Ugbua ka anyï gara gwuo ji ma ghöta afüfa. | We have just harvested yam and garden eggs. |
| - Biko, olee ebe ülö oriri dï? | Please, where is the hotel? |
| - Ülö oriri dï na ndïda na aka ekpe. | The hotel is down (this road) on the left hand. |
| N’ülö oriri: | In the hotel: |
| - Ehihie öma, | Good-afternoon, |
| i nwere mgbe? | do you have a room? |
| - E-e. | Yes. |
| - Ö dï igwe ntuonyi? | Is it air-conditioned? |
| - Mba, ö dïghï, ihe o nwere bü nkucha oyibo. | No, it is not, it has a fan. |
| - Ï chörö otu akwa ka ö bü abüö? | Do you want one or two beds? |
| - Achörö m abüö. Nwunye m ga-anonyere m. | I want two. My wife is joining me. |
| - Ego ole ka ö bü? | How much is that? |
| - Ö bü otu puku naira na narï naira atö otu abalï. | That is one thousand and three hundred naira per night. |
| - Ö dï oke ölü. | That is expensive. |
| - I nwere ndörö mmiri? | Do you have a swimming-pool? |
| - E-e, i nwere ike igwu mmiri ebe ahu. | Yes, you can swim there. |
| - I nwere ebe ana agba bölü ebea? | Do you have a football field here? |
| - E-e, ï ma ka esi agba bolu öfüma? | Yes, do you know how to play football well? |
| - E-e, ama m. | Yes, I know. |
| - Ka anyï gba bölü echi. | Let us play tomorrow. |
| - I riela nrï ütütü? | Do you have breakfast? |
| - E-e, anyï eriela nrï ütütü. | Yes, we have breakfast. |
| Ügwö abalï ole ka ï ga-akwü? | How many nights are you paying? |
| - M ga-akwü ügwö abalï atö. | I will pay for three nights. |
| - Imela. | Thank you. |
| - Kodi. | Bye. |